Confiabilidade
A confiabilidade de Deus é absoluta. Ele é fiel em todas as suas promessas, constante em seu amor e seguro em seu caráter. Podemos confiar nele completamente.
Deus é fiel
O Senhor é fiel em todas as suas palavras e bondoso em todos os seus atos. Grande é a sua fidelidade!
Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa,
nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile;
ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya,
bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.
Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;
ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ahapụkwala ọrụ aka gị niile.
Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site
nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.
Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya
na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya.
Ọ gaghị ahapụkwa ndị ya kwesiri ntụkwasị obi.
A ga-echebe ha ruo mgbe ebighị ebi,
ma ụmụ ndị ajọ omume ka a ga-egbuchapụ;
Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.
O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.
Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba."
Caráter de Deus
Toda boa dádiva vem do alto. O Senhor é bom e sua misericórdia dura para sempre. Nele podemos descansar.
Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m,
i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.
nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ
meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.
Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,
nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;
ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.
Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,
ọ ga-agba gị ume;
ọ gaghị ekwe
ka ewezuga onye ezi omume.
Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,
onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;
Integridade e confiança
Eu sou o Alfa e o Ômega — Deus é o mesmo ontem, hoje e sempre. Fiel em o que realizou e realizará por cada filho.
Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, "Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile."
Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m;
aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto,
nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke,
ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama,
nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.
Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike.
Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya.
Onye na-agba asịrị na-ekpughe ihe nzuzo,
ma onye kwesiri ntụkwasị obi na-ekpuchi ihe nzuzo.
Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha;
ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi.
"Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’
Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke.