Dependência
A dependência de Deus é o caminho da verdadeira liberdade. Sem Cristo, nada podemos fazer. Mas em Deus encontramos sustento, direção e força para todo desafio.
Sem Ele nada podemos
Sem mim nada podeis fazer. O cristão que se desconecta da videira seca — mas o que permanece dá muito fruto.
"Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla.
Chebe m, O Chineke,
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ,
ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo,
nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.
Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,
ha emerighị site nʼike nke aka ha;
ọ bụ aka nri gị, aka gị,
na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.
Nọrọnụ jii. Onyenwe anyị ga-alụrụ unu ọgụ."
Depender do Senhor
Confia no Senhor de todo o coração e não te estribes no teu próprio entendimento. Em todos os caminhos o reconhece.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị,
maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.
Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ;
maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,
ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,
ma Chineke bụ ike nke obi m,
na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile
mee ka ihu gị nwukwasị anyị,
ka e nwee ike zọpụta anyị.
Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,
olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,
onye kere eluigwe na ụwa bịa.
Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,
onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;
Mgbe m kwuru sị, "Ụkwụ m na-agbuchapụ,"
ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.
Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị,
ọ zara m, mee ka m nwere onwe m.
Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
Contentamento e confiança
Aprendi a viver contente em toda situação. A dependência de Deus nos livra da ansiedade e nos firma na paz.
Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla.
Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ejidesi aka nri gị ike
bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu;
aga m enyere gị aka.’
Ọ na-enye ndị na-ada mba ike,
na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
Dịka anyị niile nʼotu nʼotu si nwe anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, nʼotu aka ahụ, nʼime Kraịst anyị bụ otu, nʼagbanyeghị na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu anụ ahụ. E jikọtara anyị niile nʼotu nʼotu nye ibe anyị.
Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.
Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere echi, nʼihi na echi ga-echere onwe ya. Nsogbu nke ụbọchị taa ezuorola ụbọchị taa.
"Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.