Publicidade

Salmos 23

Abụ Ọma Devid.

Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ

1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, dịghị ihe akọrọ m.

2 na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,

na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,

3 na-atụte mkpụrụobi m.

na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume

nʼihi aha ya.

4 A sịkwarị na m na-aga ije,

na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,

agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;

nʼihi na nọnyeere m,

mkpọrọ gị na mkpanaka gị

na-akasị m obi.

5 na-akwado tebul23:5 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a. nʼihu m,

nʼanya ndị iro m.

I tere isi m mmanụ23:5 Mmanụ a na-ete nʼisi na-esi isi ụtọ, ọ bụ mmanụ a na-ete onye a kporo oriri iji kwanyere ya ugwu. Luk 7:46 Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.

iko m na-ejubiga oke.

6 Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m

ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,

m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị

mgbe niile ebighị ebi.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-