Deus nunca falha
Deus nunca falha. Nenhuma de suas promessas vem ao chão. O que Ele prometeu, Ele cumprirá. A fidelidade de Deus é o fundamento inabalável da nossa fé.
Promessas cumpridas
Nenhuma boa palavra falhou de todas as promessas que Deus fez. Ele é fiel e verdadeiro em tudo o que diz.
"Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị.
O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile Onyenwe anyị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.
"Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, onye nyere ndị ya, Izrel izuike dịka o kwere na nkwa. Ọ dịkwaghị okwu ọbụla nke na-emezughị nʼime ezi nkwa ahụ niile o kwere site nʼọnụ Mosis ohu ya.
Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.
O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?
O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
Fidelidade eterna
A Palavra do Senhor permanece para sempre. A tua palavra é muito pura e o teu servo a ama profundamente.
Welienụ anya unu lee anya nʼelu,
leekwanụ anya nʼụwa,
nʼihi na mbara eluigwe ga-agba barịị fuo, dịka anwụrụ ọkụ;
ụwa ga-aka nka dịka akwa,
ndị bi nʼime ya ga-anwụkwa dịka ijiji.
Ma nzọpụta m ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ezi omume m ga-adịgidekwa, ọ gaghị agwụ agwụ.
Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,
ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.
Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile
na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada
na-akwagide ndị niile dara mba.
Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume.
Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ.
Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè;
ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya,
ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,
ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ,
Ọ gaghị abụkwa ụgha.
Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya,
nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo,
ọ gaghị anọ tee aka.
Segurança em Deus
Todas as promessas de Deus são sim e amém em Cristo. Fiel é Aquele que prometeu — Ele jamais nos decepcionará.
Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ "E" na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee "Amen" nʼinye Chineke otuto. Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ. Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.
Unu bụkwa ndị a gụnyere nʼime Kraịst mgbe unu nụrụ ozi nke eziokwu ahụ bụ oziọma nke nzọpụta. Mgbe unu kwenyere, a kara unu akara nʼime ya bụ akara nke nkwa ahụ bụ Mmụọ Nsọ. Nke a bụ ihe nketa anyị tutu ruo mgbe a rụzuru ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ niile bụ ihe nweta Chineke. Ka e si otu a too ebube ya.
Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.