Dia dos avós
Os avós são tesouros vivos de sabedoria e fé. A Bíblia honra os mais velhos e celebra a transmissão de fé entre gerações — dos avós aos netos e destes aos que virão.
A bênção dos avós
A coroa dos velhos são os filhos dos filhos. A misericórdia de Deus é de geração em geração sobre os que o temem.
Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha.
Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site
nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.
Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,
ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,
maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ;
ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.
Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
Força e fidelidade
Mesmo na velhice darão frutos. Os cabelos brancos são coroa de glória. Deus não abandona seus filhos na idade avançada.
Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi.
Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,
na-ekwupụta, "Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi;
ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya."
Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,
a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,
ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.
Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.
Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.
Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha.
E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.