Pular para o conteúdo
Publicidade

Domínio próprio

Por Bíblia Online

O domínio próprio é fruto do Espírito e marca de maturidade espiritual. A Bíblia ensina que quem governa o próprio espírito é melhor do que quem conquista uma cidade.

Fruto do Espírito

O fruto do Espírito inclui domínio próprio. A graça de Deus nos ensina a viver de maneira sóbria e justa neste mundo.

Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na ijide onwe. dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.

Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè. bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. Otu a ka anyị ga-esi na-eche olileanya anyị dị ngọzị bụ ọbịbịa nke otuto nke Chineke anyị dị ukwuu, na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst.

Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.

Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma, tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi. Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.

Governar a si mesmo

Melhor é o que domina o seu espírito do que o que toma uma cidade. A cidade sem muros é o homem sem domínio próprio.

Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya.

Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.

Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya

dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.

Onye nzuzu na-egosi oke iwe ya,

ma onye nwere uche na-ejide onwe ya na-emekwa ka mmụọ ya dajụọ.

Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị

ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.

Mkpa dị mmadụ ịkwanyere onwe ya ugwu

Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ. Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi. bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe. Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.

Ma bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.

O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya.

Disciplina e vigilância

Sede sóbrios e vigilantes. O diabo anda em derredor como leão rugidor. A sobriedade nos protege e fortalece.

Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nʼihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dịka ọdụm, na-achọ onye ga-ala nʼiyi. Guzosienụ ike nʼokwukwe unu. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nʼụdị ahụhụ a unu na-ahụ nʼụwa niile.

Ọgwụgwụ oge dị nso

Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuruoke, ndị anya doro, ka unu nwee ike na-ekpekwa ekpere.

Iso Kraịst ga-eweta ihe mgbu

Ya mere, ebe bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼanụ ahụ, unu onwe unu kwesiri inwe ụdị obi ahụ o nwere. Nʼihi na onye tara ahụhụ nʼanụ ahụ akwụsịla ime mmehie. Nʼihi nke a, onye dị otu ahụ anaghị ebi ndụ fọdụrụ ya nʼụwa nʼihi agụụ ọjọọ nke ọchịchọ mmadụ, kama na-ebi ya nʼihi imezu ọchịchọ Chineke. Nʼoge gara aga unu tufuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị mba ọzọ ụtọ. Ndụ unu jupụtara nʼagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ihe ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ikpere arụsị niile, bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ha anya ebe bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ, nʼihi nke a ha na-ekwutọkwa unu. Ma ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nʼihu onye ahụ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.

ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ. bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke.

O senhorio de Cristo

Todo domínio pertence a Cristo. Ele é Senhor dos senhores e Rei dos reis — e nos capacita a viver em santidade.

Toonu Onyenwe anyị, ọrụ aka ya niile

nʼebe ọbụla na-achị.

Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile

na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.

"Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.

E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m.

Lee ka ihe ịrịbama ya,

na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu!

Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi;

ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,

e nyekwala anyị otu nwa nwoke.

ga-abụkwa onye ga-achị anyị.

Ndị a ga-abụ aha ya,

Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,

Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.

Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo

nke na-enweghị ọgwụgwụ.

bụ nʼocheeze Devid ka ga-anọkwasị,

chịakwa nʼalaeze ya.

ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;

bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ga-eji chịa

site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ga-emezukwa nke a.Onyenwe anyị

Nʼihi na napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya hụrụ nʼanya. Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile.

Nke rụrụ nʼime Kraịst mgbe o si nʼọnwụ kpọlite ya mee ya ka nọdụ nʼaka nri ya nʼebe niile nke eluigwe. Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa.

Ma ebe obibi anyị dị nʼeluigwe, ebe anyị na-atụsi anya ike na Onye nzọpụta bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-esi bịa. Onye ga-agbanwe ahụ anyị dị ala ka dị ka nke ya dị ebube, site nʼike nke mere ka o debe ihe niile nʼokpuru ya.

Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe nọ ọzọ.

Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.

Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya.

Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst. Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote. Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile. Nʼihi na ga-abụ eze tutu ruo mgbe lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya.

"Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;

bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.

Seja o primeiro