Pular para o conteúdo
Publicidade

Jó 25

Okwu Bildad

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:

2 "Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;

bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.

3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?

Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?

4 Mmadụ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?

Mmadụ nwanyị mụrụ ga-esi aṅaa dị ọcha?

5 Lee, bụladị ọnwa adịghị achawapụta,

ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,

6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,

mmadụ, nke bụ naanị idide."

Veja também