Esperar no Senhor
Esperar no Senhor é ato de fé e confiança. A Bíblia promete que os que esperam em Deus renovam as forças, recebem direção e experimentam a fidelidade divina no tempo certo.
Renovar as forças
Os que esperam no Senhor renovam as forças. Sobem como águias, correm e não se cansam, caminham e não se fatigam.
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya,
ka o gosi unu ịhụnanya ya.
O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya.
Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
Olileanya m bụ nke a:
Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị
nʼala ndị dị ndụ.
Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha
ka ha ripịa anụ ahụ m,
ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,
bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,
obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;
ọ bụladị na agha adaa imegide m,
nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,
ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;
ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;
ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu
karịa ndị iro m gbara m gburugburu;
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.
Meere m ebere, zaa m.
Obi m na-ekwu banyere gị, "Chọọ ihu ya!"
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
Ezonarịla m ihu gị,
agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;
nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.
O Chineke, Onye nzọpụta m,
ahapụkwala m.
Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m,
Onyenwe anyị ga-anabata m.
Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị;
duo m nʼụzọ kwesiri
nʼihi ndị na-akpagbu m.
Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha,
ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m,
ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
Olileanya m bụ nke a:
Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị
nʼala ndị dị ndụ.
Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
Espera paciente
Esperei com paciência no Senhor e Ele se inclinou para mim. Confie nele e descanse — Ele agirá no tempo certo.
Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,
ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
O sitere nʼolulu na-amị amị,
nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;
o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,
nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,
abụ otuto nye Chineke anyị.
Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,
ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;
onye na-adịghị ele ndị mpako anya
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
O Onyenwe anyị Chineke m,
ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,
ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile
ị kwadooro maka inye anyị;
a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,
ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.
Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ
ma ị megheela ntị abụọ;
aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
Mgbe ahụ, ekwuru m sị, "Lee m, abịala m,
e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.
O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,
iwu gị dị nʼime obi m."
Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;
dịka ị maara, o Onyenwe anyị,
anaghị m emechi ọnụ m.
Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,
ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.
Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,
nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,
ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu;
mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ:
ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi,
obi m na-adakwa mba nʼime m.
O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m;
O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,
bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara;
ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m,
laghachi azụ nʼihere.
Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;
ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.
Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;
nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,
dịka olileanya anyị dị na gị.
Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya,
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị.
Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ,
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ.
O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa.
Chere Onyenwe anyị,
debekwa ụzọ ya.
Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa;
mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
Confiança e perseverança
Confie no Senhor de todo o coração. Sede pacientes na tribulação — o Senhor é fiel e cumprirá todas as suas promessas.
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
adaberekwala na nghọta gị.
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Ọ bụkwaghị naanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime nsogbu anyị niile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachiobi. Ntachiobi na-arụpụta nʼime anyị ezi agwa; ezi agwa na-arụpụtakwa olileanya.
Ebe a na-eme ka unu dị ike nʼime ike niile, dị ka ike nke ebube ya si dị. Ka unu nwee ndidi na ogologo ntachiobi,
Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.
Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko.
Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu. Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa. Nʼihi na,
"Mmadụ niile dị ka ahịhịa,
ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa,
ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi."
Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.
Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
"A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.
"Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’
"Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’
"Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’
"Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
"Emesịa, ise ndị nzuzu ahụ lọghachiri na-ekwu sị, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, meghere anyị ụzọ!’
"Ma ọ zaghachiri ha sị, ‘Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, amaghị m ndị unu bụ.’
"Ya mere, na-anọgidenụ na nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ.