Pular para o conteúdo
Publicidade

Filho de Deus

Por Bíblia Online

Jesus é o Filho de Deus — a revelação suprema do Pai. Nele habita toda a plenitude da divindade e por Ele temos acesso ao Pai, à salvação e à vida eterna.

A revelação do Filho

O Filho é o resplendor da glória de Deus. Quem vê o Filho vê o Pai. Jesus é a imagem perfeita do Deus invisível.

na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. Ya mere, bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.

Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.

dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.

Jisọs sịrị ha, "Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ." Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.

Confissão e fé

Tu és o Cristo, o Filho do Deus vivo! Quem confessa que Jesus é o Filho de Deus, Deus permanece nele.

Ọgbụgba ama Pita

Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, "Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?"

Ha zara ya sị, "Ụfọdụ na-asị na bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma."

jụrụ ha sị, "Ma unu onwe unu, bụ onye ka unu na-asị na m bụ?"

Saimọn Pita zara sị ya, "bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ."

Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi. Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, "Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma."

Chineke bi nʼime onye ọbụla nke na-ekwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nʼime Chineke.

E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya. Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.

Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.

Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.

Vida no Filho

Deus enviou seu Filho ao mundo para que vivêssemos por Ele. O Filho dá vida, julga e reconcilia os pecadores com o Pai.

Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.

Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla masịrị ya ndụ. Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara. Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.

Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya.

Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.

bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu, ka gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara. Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, "Abba, Nna."

Nʼihi na, bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya.

Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,

e nyekwala anyị otu nwa nwoke.

ga-abụkwa onye ga-achị anyị.

Ndị a ga-abụ aha ya,

Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,

Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.

Seja o primeiro