Publicidade

Gratidão a Deus

Por Bíblia Online

A gratidão a Deus é atitude que transforma a vida. Reconhecer que toda boa dádiva vem de Deus nos leva a louvar, servir e viver com alegria e propósito.

Tudo vem de Deus

Toda boa dádiva vem do alto. Agradecer a Deus é reconhecer que Ele é a fonte de toda bênção e sustento.

Ihe niile Chineke kere dị mma, dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma bụrụ na e jiri ekele nara ya,

Ihe niile Chineke kere dị mma, dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma bụrụ na e jiri ekele nara ya, nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.

Amara Onyenwe anyị nye Pọl

Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe họpụtara m ijere ya ozi.

Iwu banyere Ofufe na Ekpere

Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,

na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè.

Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele.

Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.

Louvor e gratidão

Louvai ao Senhor e dai-lhe graças! Ele fez maravilhas e é digno de todo louvor e agradecimento.

Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,

aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.

"Chụọrọ Chineke aja ekele,

mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,

Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,

jirikwa ekele bulie ya elu.

Ma ka ndị niile na-achọ gị

ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị,

ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,

"Onyenwe anyị dị ukwuu."

Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke

Anyị na-eto gị, O Chineke.

Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.

Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.

Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị

ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi;

anyị ga na-ekwupụta otuto gị,

site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya

jiri otuto baa nʼogige ya;

keleenụ ya, tookwa aha ya.

I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu;

napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.

I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ.

O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya,

meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile rụrụ.

Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na dị mma,

nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Expressões de gratidão

Dar graças com oração e súplica. A gratidão se expressa em palavras, atos e atitudes que glorificam a Deus.

Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.

Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele.

ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.

Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.

Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.

na-asị,

"Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.

Onye na-adị, na onye dịkwaarị,

nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị

malitekwa ịchị ọchịchị.

Ma bụ olu abụ ekele

ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.

Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.

Nʼihi na Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ "

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-28_14-13-17-