Gratidão a Deus
A gratidão a Deus é atitude que transforma a vida. Reconhecer que toda boa dádiva vem de Deus nos leva a louvar, servir e viver com alegria e propósito.
Tudo vem de Deus
Toda boa dádiva vem do alto. Agradecer a Deus é reconhecer que Ele é a fonte de toda bênção e sustento.
Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya,
Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya, nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.
Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi.
Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,
na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè.
Bụrụnụ ndị mgbọrọgwụ ha mibanyere nʼime ya, ndị a na-ewuli elu nʼime ya, ndị dị ike nʼime okwukwe, dị ka e si kuziere unu, ndị jupụtara na-inye ekele.
Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.
Louvor e gratidão
Louvai ao Senhor e dai-lhe graças! Ele fez maravilhas e é digno de todo louvor e agradecimento.
Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,
aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
"Chụọrọ Chineke aja ekele,
mezuo nkwa i kwere Onye kachasị ihe niile elu,
Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,
jirikwa ekele bulie ya elu.
Ma ka ndị niile na-achọ gị
ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị,
ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,
"Onyenwe anyị dị ukwuu."
Anyị na-eto gị, O Chineke.
Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.
Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị
ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi;
anyị ga na-ekwupụta otuto gị,
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya.
I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu;
ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme.
I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ.
O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya,
meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Expressões de gratidão
Dar graças com oração e súplica. A gratidão se expressa em palavras, atos e atitudes que glorificam a Deus.
Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke.
Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele.
Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.
Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
na-asị,
"Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile.
Onye na-adị, na onye dịkwaarị,
nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị
malitekwa ịchị ọchịchị.
Ma ọ bụ olu abụ ekele
ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.
Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.
Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ "