Publicidade

Jonas 2

1 Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. 2 sịrị,

"Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,

zakwara m.

Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,

nụkwara olu akwa m.

3 tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,

nʼetiti oke osimiri.

Osimiri dịkwa m gburugburu,

ebili mmiri gị na mmali mmiri gị

gabigakwara m nʼisi.

4 Mgbe ahụ, asịrị m, E sitela nʼihu gị

chụpụ m;

ma otu dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ

nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.

5 Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,

ogbu mmiri na-erikpu m.

Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.

6 Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,

ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.

Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,

Onyenwe anyị, bụ Chineke m.

7 "Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,

e chetara m gị Onyenwe anyị,

ma ekpere m bịakwutere gị,

nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.

8 "Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,

na-agbakụta ebere Chineke azụ.

9 Ma bụ olu abụ ekele

ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.

Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.

Nʼihi na Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ "

10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka gbọpụta Jona nʼala akọrọ.

Veja também

Publicidade
Jonas
Ver todos os capítulos de Jonas
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-28_14-13-17-