Publicidade

Intimidade com Deus

Por Bíblia Online

A intimidade com Deus é o maior privilégio do cristão. Ele nos convida a nos aproximar, a conhecê-lo profundamente e a desfrutar de comunhão diária com o Criador do universo.

Aproximar-se de Deus

Chegai-vos a Deus e Ele se chegará a vós. Deus deseja intimidade, não religiosidade. Ele busca os que o buscam de todo coração.

Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ.

Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ,

bịanụ na mmiri,

unu ndị na-enweghị ego

bịanụ zụọ, riekwa.

Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi

na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla.

Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri?

Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ?

Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri

mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!

"Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m!

Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ.

Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi,

bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.

Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama,

ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.

Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị,

mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị,

nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị,

Onye nsọ nke Izrel,

nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma."

Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.

Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.

Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha.

Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.

‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’

Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, ọ bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.

Sede de Deus

Como a corça deseja as correntes de água, assim a minha alma suspira por ti, ó Deus. A intimidade nasce do desejo profundo.

Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,

otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.

Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.

Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?

O Chineke, ị bụ Chineke m,

e ji m obi m niile na-achọ gị;

akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,

anụ ahụ m na-achọsi gị ike,

nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba

ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.

Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị,

hụkwa ike gị na ebube gị.

Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,

aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.

Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,

aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.

Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ;

aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.

Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị,

ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.

Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m,

ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.

Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ;

aka nri gị na-ejigide m.

A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi;

ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.

A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi,

ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.

Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke;

ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya,

ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.

Unidade com o Pai

Jesus orou pela unidade dos seus com o Pai. A intimidade com Deus inclui confissão, perdão e alegria na comunhão.

Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu; Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya.

Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,

ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.

Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;

nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,

kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ."

Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-22_10-02-25-