Publicidade

Juízo

Por Bíblia Online

O juízo de Deus é manifestação de sua justiça e soberania. Ele julga o mundo, julga as nações e julga cada coração com perfeita equidade e misericórdia.

O juízo de Deus

Deus é juiz justo que prova os corações. Seu juízo é verdadeiro e alcança toda obra, secreta ou pública.

Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,

ya na ihe nzuzo anyị niile,

ma ha dị mma ma ha dị njọ.

Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla masịrị ya ndụ. Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara. Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya.

"Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na bụ Nwa nke Mmadụ.

"Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.

Ọgbụgba ama maka Jisọs

"bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu.

Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. Mgbe bịara, ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe, maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m;

Jisọs zara ma sị, "Olu a abịaghị nʼihi m kama bịara nʼihi unu. Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a. Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m."

sịrị, "Onyenwe m, ekwela m." kpọrọ isiala nye ya.

Jisọs sịrị, "bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì."

Prestando contas

Cada um prestará contas de si mesmo a Deus. O juízo começa pela casa de Deus e depois alcança os que não obedecem ao evangelho.

Ndị dị ike na ndị dara mba

Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi. Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri. Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ. Onye ka bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye dịrị ikpebi ma odibo ya na-emezi emezi ma dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.

E, anyị niile nʼotu nʼotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nʼihu Chineke.

A kwadala nwa nna gị

Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ. Dịka onye nọ nʼime Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya nke ọma na o nweghị ihe ọbụla na-adịghị ọcha na nke onwe ya. Ma bụrụ na onye ọbụla na-ahụta ihe ọbụla dịka ihe na-adịghị ọcha, nye onye dị otu a, ihe ahụ adịghị ọcha.

Nʼihi na oge eruola, mgbe a ga-amalite ikpe nʼezinaụlọ Chineke. bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwenyeghị nʼoziọma Chineke?

Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.

Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.

"Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya ma dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? Olee otu ga-esi gwa ya si, Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.

Justiça e redenção

O juízo de Deus é também redenção. Ele livrou Israel do Egito com juízos e salva os arrependidos pela cruz de Cristo.

"Ya mere, gwa ụmụ Izrel, Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu.

"Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.

bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,

mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,

nke mere na bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe na-ekwu okwu,

na onye ezi omume mgbe na-ekpe ikpe.

Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ,

obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ

nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.

Ha ji anyụike na egbugbu ha

kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.

Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa.

Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.

Otuto dịrị Onyenwe anyị

Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị,

"Haleluya!

Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị.

Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.

kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe,

onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa.

bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya."

Ọzọkwa, ha tiri mkpu,

"Haleluya!

Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi."

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-