Mãe
A mãe é honrada na Bíblia como pilar da família. Seu amor incondicional, sua sabedoria e sua dedicação são celebrados como reflexo do próprio amor de Deus por seus filhos.
O amor de mãe
Pode uma mãe esquecer-se do filho do seu ventre? Ainda que ela se esquecesse, Deus nunca nos abandona. O amor materno reflete o divino.
Dịka nne si akasị nwa ya obi,
otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.
Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi."
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị,
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị
Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.
Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;
ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu. Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.
Sabedoria e instrução
A mãe sábia instrui os filhos nos caminhos de Deus. Seu ensino é lei que guia e sua disciplina é expressão de amor verdadeiro.
Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;
ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.
Nwa nke maara ihe na-eme ka obi tọọ nna ya ụtọ,
ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.
Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha.
Honrar a mãe
Honra teu pai e tua mãe. A mulher virtuosa é digna de louvor — seus filhos se levantam e a chamam bem-aventurada.
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Ụmụntakịrị na ndị mụrụ ha
Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. "Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."
Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya?
Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.
Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu
ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya,
ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
Ụmụ ya na-ebili gọzie ya;
otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
Ọ ga-asị; "E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha,
ma gị onwe gị kachasị ha niile mma."
Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.
Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
Este artigo te tocou? Faça uma oração!
+581 estão orando agora.
Junte-se à corrente de oração.