Pular para o conteúdo
Publicidade

Milagres

Por Bíblia Online

Os milagres manifestam o poder soberano de Deus. Desde a criação até os sinais de Jesus e dos apóstolos, Deus intervém sobrenaturalmente na história para revelar sua glória e amor.

O Deus dos milagres

Para Deus nada é impossível. Ele abriu o mar, fez cair fogo do céu e ressuscitou mortos. Seu poder não tem limites.

Jisọs legidere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ."

Jisọs legidere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ."

Nʼihi na dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere."

"Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. dị ihe ọbụla karịrị m ime?

Mgbe ahụ, Mosis setịpụrụ aka ya nʼelu Osimiri Uhie ahụ. Onyenwe anyị ji oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke fere nʼabalị ahụ niile, nughachi osimiri ahụ, mee ka osimiri ahụ kebie ụzọ abụọ, ka ụzọ pụta nʼala osimiri ahụ. Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.

Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;

e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.

Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,

tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche."

bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;

na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.

Milagres pela fé

Se tiverdes fé como um grão de mostarda, movereis montanhas. A fé é a chave que acessa o poder miraculoso de Deus.

sịrị ha, "bụ nʼihi na okwukwe unu nwere esighị ike. Nʼezie, agwa m unu, bụrụ na unu e nwee okwukwe nke dị nta ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike sị ugwu a, Site nʼebe a wezuga onwe gị,ga-apụtakwa. dịghị ihe unu na-agaghị enwe ike ime.

Jisọs zara sị ha, "Nʼezie agwa m unu, bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.ga-emezukwa.

Jisọs sịrị ya, " bụrụ na i nwere ike? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ."

Ma Jisọs lere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ, bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. dịghị ihe rara Chineke ahụ ime."

sịrị, "Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime."

Ya mere, rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nʼebe ahụ, nʼihi na ha enweghị okwukwe nʼime ha.

Sinais e prodígios

Os apóstolos realizaram sinais e maravilhas em nome de Jesus. Os dons do Espírito incluem a operação de milagres e a fé sobrenatural.

"Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ.

Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nʼime ya mara jijiji. Ha jupụtara na Mmụọ Nsọ, ma jiri nkwuwa okwu kwusaakwa okwu Chineke.

Ụmụ Skiva

Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche. Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.

Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ.

Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche.

Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, site nʼotu Mmụọ ahụ. Otu Mmụọ nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. Onye ọzọ ka na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, onye ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọkwa ka na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.

Ma Jisọs gwara ha sị, "Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.

Milagres de cura e provisão

A oração da fé salvará o enfermo. Deus provê, cura e intervém quando clamamos a Ele com fé genuína.

Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya. Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.

Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii. Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.

O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ. Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.

Ọgwụgwọ onye ọrịa nʼụbọchị izuike

Nʼụbọchị izuike ndị Juu, banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara dị ya ike afọ iri na asatọ. na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. Mgbe Jisọs hụrụ ya, kpọrọ ya sị ya, "Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị." Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.

Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, "E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, bụghị nʼụbọchị izuike."

Ma Onyenwe anyị zara ya sị, "Unu ndị ihu abụọ! dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?"

Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile na-arụ.

Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.

Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, "Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa."

Ma Jisọs sịrị ya, "I kweere nʼihi na hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere."

Ihe mere e ji dee akwụkwọ oziọma Jọn

dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.

Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. hụrụ ma kwerekwa. (Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ghaghị i si nʼọnwụ bilie.)

Discernimento nos sinais

A Bíblia alerta contra falsos milagres e sinais enganosos. Devemos provar os espíritos e não seguir sinais que desviam de Deus.

Ikpere chi ndị ọzọ

bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime, bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, "Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha," bụ chi ndị na-amaghị, egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya. bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.

Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ. Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịbama. bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa niile ịchịkọta ha maka ibu agha nʼụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.

Ihe ịrịbama Jona

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, "Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama."

Ma zara sị ha, "bụ naanị ajọ ọgbọ nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịbama. Ma dịkwaghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịbama Jona onye amụma. Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala.

Abụmọnụ nye obodo ndị na-ekwenyeghị

Mgbe ahụ bidoro ịbụ obodo niile ebe rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị. "Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi. Nʼezie asị m unu na ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn. Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. gaara adịrị ruo taa. Nʼezie asị m unu, ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm."

A criação como milagre

O próprio corpo humano é milagre de Deus. Toda a criação testifica do poder e da sabedoria do Criador.

bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.

bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;

ọrụ gị niile dị ebube;

amaara m nke a nke ọma.

Ekele nʼihi nnapụta Chineke

O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,

aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile na-eme.

Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.

Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, "Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel" (nke bụ ma asụgharịa ya, "Chineke nọnyeere anyị").

Ma mgbe ha hụrụ ya ka na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na bụ mmụọ, tie mkpu akwa. Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha.

Na-atụfughị oge, gwara ha sị, "Nweenụ obi ike! bụ m. Unu atụla egwu."

Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, zara ya sị, "Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya."

Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ, na-asị,

"Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị."

"Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu."

Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.

Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?

Igurube ejupụta ala Ijipt

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, "Jekwuru Fero nʼihi na emeela m ka obi ya, na obi ndị na-ejere ya ozi sie ike, ka m nwee ike rụọ ọrụ ịrịbama ndị a dị iche iche nʼetiti ha. Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ Onyenwe anyị."

Seja o primeiro