Publicidade

Natal

Por Bíblia Online

O Natal celebra o maior milagre da história: Deus se fez homem. O menino Jesus, nascido em Belém, é Emanuel — Deus conosco — a esperança do mundo inteiro.

O nascimento do Salvador

O anjo anunciou: hoje vos nasceu um Salvador, que é Cristo, o Senhor! A virgem concebeu pelo Espírito Santo e deu à luz o Filho de Deus.

Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, "Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile.

Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị.

Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha.

Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru. Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.

A profecia cumprida

Isaías profetizou: a virgem conceberá e dará à luz um filho que se chamará Emanuel. Em Jesus, essa promessa se cumpriu perfeitamente.

Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị.

Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ.

Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, na-azọpụta. nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha."

Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, "Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel" (nke bụ ma asụgharịa ya, "Chineke nọnyeere anyị").

Glória a Deus nas alturas

Os pastores glorificaram a Deus e os anjos cantaram: 'Glória a Deus nas alturas e paz na terra entre os homens a quem Ele quer bem!'

"Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe.

Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma."

Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-22_10-02-25-