Obediência aos pais
A obediência aos pais é mandamento divino com promessa de vida longa. A Bíblia valoriza a honra filial e ensina os filhos a respeitar e obedecer aos pais com amor.
Honrar pai e mãe
O quinto mandamento ordena honrar pai e mãe. É o primeiro mandamento com promessa: para que vá bem e vivas muito na terra.
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.’
Ụmụntakịrị na ndị mụrụ ha
Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. "Sọpụrụ nne gị na nna gị," nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. "Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa."
Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị.
Obedecer e respeitar
Filhos, obedecei a vossos pais no Senhor. A obediência filial é expressão de amor e temor a Deus.
Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu
Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Ịdọ aka na ntị banyere ịkwa iko
Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu,
ahapụkwala iwu nke nne gị.
Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile,
ka ị ghara ichefu ha.
Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;
mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị.
Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
Nʼihi na iwu a bụ oriọna,
Ihe ozizi a bụkwa ìhè,
otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba
bụ ụzọ ezi ndụ,
Amamihe Kachasị ihe niile
Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,
lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;
ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,
mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
ọ ziri m ihe, sịkwa m,
"Ka obi gị jidesie okwu m niile ike,
debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,
echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,
hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya
ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi,
mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Disciplina e consequências
A vara e a repreensão dão sabedoria. A Bíblia adverte sobre as consequências sérias da rebeldia e desonra aos pais.
Ịba mba na iti nwantakịrị ihe na-enye aka mee ka ọ bụrụ ezi nwa,
ma nwantakịrị a na-adịghị adụ ọdụ na-eme nne ya ihe ihere.
Ọ bụ nwa ahụ na-eweta ihere ga-ezu nne na nna ya ohi,
maọbụ chụpụ ha site nʼụlọ ya.
"Onye ahụ na-akwa nna ya emo,
nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị,
ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya,
udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
"Ọ bụrụ na onye ọbụla etie nna ya maọbụ nne ya ihe, a ghaghị ime ka onye dị otu a nwụọ.
Nwa isiike
Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị. Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, "Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke." Ndị ikom niile nke obodo ahụ ga-ewere nkume tugbuo ya. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ ahụ nʼetiti unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe mere, ụjọ ga-atụkwa ha.
Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya
ka Chineke na-afụnyụ.
Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.
Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.