Publicidade

O poder da oração

Por Bíblia Online

A oração é o canal mais poderoso de comunicação com Deus. Através dela, milagres acontecem, montanhas são movidas e o impossível se torna possível.

Pedidos com fé

Jesus ensinou: pedi e recebereis. Tudo o que pedirmos em seu nome, crendo, Ele fará. A fé transforma a oração em poder.

Rịọọnụ, chọọnụ, kụọnụ aka

"Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ.

Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya."

Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ga-abụkwa nke unu.

Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.

Oração e milagres

A oração dos justos tem grande poder. Pedro orou e Dorcas ressuscitou. Jesus disse que certos demônios só se expulsam com jejum e oração.

Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, "Tabita, bilie." O meghere anya ya, ma mgbe hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala.

sịrị ha, "bụ naanị site nʼike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị a."

dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya. Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.

Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,

o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile.

O mere ka oke ifufe dere duu;

o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.

Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe dajụrụ,

o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.

Orar em todo tempo

A Bíblia nos exorta a orar sem cessar, com ações de graças e súplicas, revestidos da armadura espiritual. A oração traz paz sobrenatural.

Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.

Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile.

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-