Pular para o conteúdo
Publicidade

Preservação das escrituras

Por Bíblia Online

A Palavra de Deus permanece para sempre. As Escrituras foram preservadas por Deus ao longo dos milênios para instrução, consolação e guia de todas as gerações.

A Palavra eterna

Céus e terra passarão, mas as palavras de Deus jamais passarão. Sua Palavra é eterna, infalível e imutável — a verdade que sustenta tudo.

Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga.

Nʼezie, agwa m unu, na tutu eluigwe na ụwa agabiga, dịghị otu mkpụrụ edemede ọbụla dị nta, bụladị nke dịkarịsịrị nta, nke a ga-esi nʼIwu a wepụ ruo mgbe ha niile ga emezu.

E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa,

ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi."

Nʼihi na,

"Mmadụ niile dị ka ahịhịa,

ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa,

ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,

ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi."

Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.

Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa. Nʼihi na,

"Mmadụ niile dị ka ahịhịa,

ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa,

ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,

ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi."

Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.

A inspiração divina

Toda Escritura é inspirada por Deus. Homens santos falaram da parte do Senhor, e a Palavra escrita é a expressão fiel da vontade divina.

Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị. Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, bụ Mmụọ Nsọ duru ha.

Okwu Chineke site nʼỌkpara ya

Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche. Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.

Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.

Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.

A Palavra como guia e tesouro

A Palavra de Deus é lâmpada para os pés, espada do Espírito e tesouro para o coração. Guardá-la e meditá-la nos protege do pecado.

Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,

igbochi m imehie imegide gị.

Akaọrụ Chineke na iwu ya

Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke;

mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.

Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu,

ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.

Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,

ma a na-anụ ụda ha.

Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,

okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.

bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.

dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,

dịka ọgba ọsọ nke na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.

na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,

bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.

dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.

Iwu Onyenwe anyị zuruoke;

na-eweghachi mkpụrụobi.

Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;

na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.

Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,

na-enye mkpụrụobi ọṅụ.

Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,

na-enye anya ìhè.

Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke,

ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ,

nke a nụchara ugboro asaa.

O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo

ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.

Ma gịnị ka na-ekwu? "Okwu ahụ nọ gị nso, dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị," bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.

Ma bụ ihe doro anya na bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. Ma ana m ajụ, ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.

"Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,

okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ."

Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.

Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ga-eme ka dịrị gị nʼobi. ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe na-aga nʼokporoụzọ, mgbe na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụzọ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.

na ịmatakwa ịhụnanya nke Kraịst nke karịrị amamihe, ka unu jupụtakwa nʼizuoke niile nke Chineke.

Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ. Onye chọrọ ka a zọpụta mmadụ niile, ka ha niile bịaruo na mmazu nke eziokwu.

Seja o primeiro