Publicidade

Protecção e segurança

Por Bíblia Online

Deus é nosso protetor e refúgio seguro. Em todas as circunstâncias, a Bíblia nos assegura que o Senhor guarda, sustenta e protege aqueles que nele confiam.

Deus, a nossa fortaleza

O Senhor é refúgio e fortaleza, socorro bem presente na angústia. Quem habita no esconderijo do Altíssimo descansa à sombra do Todo-Poderoso.

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka bụ nʼoge nsogbu.

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka bụ nʼoge nsogbu.

Chineke onye na-echebe anyị

Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu

ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.

Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, "bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,

Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m."

ga-eji nku ya kpuchie gị.

bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ga-agbaba zere ndụ,

ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.

Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,

iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,

ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.

bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,

bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,

mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị;

ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.

Abụ nke iguzosi ike

Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu ya?

Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,

bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?

Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;

bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.

Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.

bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.

O escudo do Senhor

Deus nos rodeia com sua proteção como um escudo. Ele é rocha, baluarte e libertador. Sua fidelidade nos cobre e nos guarda.

Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;

I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.

Ekpere maka enyemaka

O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.

Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,

"Chineke agaghị azọpụta ya." Sela

Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;

I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.

Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,

nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela

Edinara m ala, hie ụra,

ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.

A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,

agaghị m atụ egwu ọbụla.

Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,

okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha;

bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.

na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,

aka nri gị na-akwagidekwa m,

inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.

na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,

ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.

Abụ nke dike nʼagha

Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,

onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,

na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.

bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,

ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,

bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,

onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.

gị onye na-enye ndị eze mmeri,

onye na-agbapụta ohu ya Devid.

Site na mma agha dị njọ

Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;

mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ.

Were aka nchebe gị kpuchie ha,

ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.

Nʼezie, O Onyenwe anyị, na-agọzi onye ezi omume.

na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.

Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ga-aza m;

gee m ntị ma nụrụ ekpere m.

Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube;

gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta

ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.

Chebe m dịka mkpụrụ anya gị;

zoo m na ndo nke nku gị,

site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu,

bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.

Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,

agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya

nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.

ga-anwụchi ndị iro gị niile;

aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.

Mgbe pụtara ịlụ ọgụ,

ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.

Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha,

ọkụ ya ga-erepịakwa ha.

Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;

ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.

bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela

Segurança e provisão

O Senhor supre todas as necessidades dos seus filhos. Quem busca o Reino primeiro não precisa temer — nada faltará aos que temem ao Senhor.

Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ

Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, dịghị ihe akọrọ m.

Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha,

ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.

Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi;

biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.

Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,

ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,

maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.

bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.

Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.

Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.

Rịọọnụ, chọọnụ, kụọnụ aka

"Na-arịọnụ, unu ga-arịọta, na-achọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka nʼụzọ, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ, na-arịọta. Onye na-achọ, na-achọta. Onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ.

Ya mere, ebe unu ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nʼeluigwe gaghị enye unu karịa, ma bụrụ na unu arịọọ ya!

Guarda e livramento

O anjo do Senhor acampa ao redor dos que o temem e os livra. Deus promete guardar todas as nossas saídas e entradas para sempre.

Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu

na-anapụtakwa ha.

Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya;

dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ

Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile,

olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?

Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị,

onye kere eluigwe na ụwa bịa.

gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ,

onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;

nʼezie onye na-eche Izrel nche

adịghị arahụ ụra, dịghị atụkwa oru ụra.

Onyenwe anyị na-eche gị nche,

Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;

anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie,

ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.

Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.

ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.

Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe na-apụ na mgbe na-abata abata,

site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.

Ekpere maka iguzosi ike

Chebe m, O Chineke,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.

Ekpere maka iguzosi ike

Chebe m, O Chineke,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.

Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.

Ebe nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.

Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.

Ebe nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.

Ekpere maka enyemaka

Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;

ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.

Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,

ma site na Zayọn kwagide gị.

Chebe ndụ m ma gbapụta m;

ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ

Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu,

nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.

Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.

bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.

Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,

ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.

ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.

ga-echebekwa ha bụladị nʼoge ụnwụ.

Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;

bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.

Confiança inabalável

Melhor é confiar no Senhor do que confiar no homem. Quem anda em integridade anda seguro, e a torre forte do nome do Senhor protege o justo.

Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?

kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị

karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.

Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,

ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike,

ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba;

nye ụmụ ya ga-abụkwa ebe ize ndụ.

Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị,

ga-echebekwa gị.

Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,

ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.

"Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,

bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

"Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,

bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.

Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,

ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.

Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya,

ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.

Nʼihi na bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;

nʼebe nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.

na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu,

bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.

na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso,

na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.

Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya.

Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.

E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha,

maọbụ naanị Onyenwe anyị na-enye mmeri.

Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.

A presença protetora

O Senhor prometeu estar conosco e nunca nos desampara. Ele é como sombra à nossa direita e fortaleza em todo o tempo.

Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. gaghị agbakụta unu azụ, gakwaghị ahapụ unu."

Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị.

Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị.

ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị,

Bibie ha!

Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị,

"Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya.

Nʼihi na ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile.

bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ."

Nʼụbọchị ahụ, dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire.

Ọzọ, ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide.

Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị.

Mkpepụta ha na-esite na m."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike

nwee udo zuruoke,

nʼihi na bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.

Mụ onwe m, bụ onye ahụ, bụ m ga-elekọtakwa unu anya,

bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.

Nʼihi na bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.

Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.

Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,

otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,

ga-ekpuchi ya napụta ya,

ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya."

Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi,

nyerenụ ndị a na-emegbu aka.

Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ,

ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ.

bụrụ na unu ga-ekwenye, bụrụ na unu ga-erubere m isi,

aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.

Ma bụrụ na unu ajụ ma nupu isi,

bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu."

Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.

Nọrọnụ jii. Onyenwe anyị ga-alụrụ unu ọgụ."

Onyenwe anyị dị mma.

bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu.

na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,

Promessas de cuidado

Deus garante que nem um fio de cabelo cairá sem sua permissão. Ele deseja que vivamos em paz, confiança e segurança total nele.

bụghị otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ? Ma otu nʼime ha agaghị ada nʼala ma bụrụ na Nna unu bi nʼeluigwe amaghị. bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ka a maara ọnụọgụgụ ha. Ya mere, unu atụla egwu. Unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.

Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya."

Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu.

gwara ha, "Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?"

Ha sịrị, "O nweghị ihe kọrọ anyị."

Ọnọdụ na-enweghị atụ nke anyị nwere

Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?

Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo,

"Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?"

Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.

Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị.

Fidelidade e aliança

Deus é fiel à sua aliança. Ele protege cada promessa que faz e guarda os seus como a menina dos seus olhos.

Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.

na-anatakwa ya ihe ọbụla anyị rịọrọ nʼihi na anyị na-erube isi nʼiwu ya, na-emekwa ihe na-atọ ya ụtọ.

Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, na-anụ olu anyị. bụrụkwanụ na anyị matara na na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.

Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.

Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru.

Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ.

Nʼihi na onye bụ Chineke, ma bụghị naanị Onyenwe anyị?

Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma bụghị naanị Chineke?

Ugbu a biko, ka masị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ka dịgide nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na gị, o Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola ya, sitekwa na ngọzị gị, ụlọ ohu gị ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi."

O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla gara.

Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.

" Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ.

Ebe bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa."

Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla

tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya

ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.

Provisão diária

Deus satisfaz os desejos do coração dos seus filhos. Ele abençoa, renova as forças e sustenta dia após dia quem nele confia.

O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,

ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.

Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,

ga-agba gị ume;

gaghị ekwe

ka ewezuga onye ezi omume.

Ma aga m abụ abụ banyere ike gị,

nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị;

bụ ebe mgbaba m e wusiri ike,

ebe mgbaba m nʼoge nsogbu.

Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke;

ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya,

ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.

Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto,

toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya,

Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.

bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,

onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.

Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị,

Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela

Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu,

onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt.

Meghe ọnụ unu ka saa mbara, aga m emeju ya.

Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta;

Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ;

naghị egbochi ihe ọma ọbụla

site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.

Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị,

nʼihi na na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi

ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.

Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;

mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, zọpụtara m.

Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,

nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.

Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,

anya m site na anya mmiri akwa,

napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị

nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.

bụ ebe mgbaba m na ọta m;

olileanya m dị nʼokwu gị.

Chineke dị mkpa

bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ,

ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.

bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo,

nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.

"Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid

ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.

Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe

ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma."

Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;

ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ahapụkwala ọrụ aka gị niile.

I na-asaghepụ aka gị

na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.

na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu

na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri.

Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha,

Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì,

Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba,

Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.

Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa,

na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ,

ma na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.

Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,

nʼihi na bụ naanị gị Onyenwe anyị,

na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.

Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu. Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe.

"Mmadụ na-ezu ihe bụ nke Chineke nʼohi? Ma unu apụnarịla m ihe bụ nke m.

"Ma unu na-ajụ: Anyị si aṅaa na-ezu gị ohi?

"bụ site nʼotu ụzọ nʼime ụzọ iri unu, onyinye na aja niile. Nʼihi ya, ọbụbụ ọnụ dịịrị unu, ka mba niile unu ha, nʼihi na bụ mụ onwe m ka unu na-ezu ohi. Webatanụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile unu nʼime ụlọakụ m, ka nri jupụta nʼime ụlọ m. Jirinụ nke a nwalee m," ka unu hụ ma mụ onwe m agaghị emeghe ọnụ ụzọ eluigwe, site na ya wụdatara unu ngọzị dị ukwuu, nke ga-ejubiga oke na ọnọdụ agaghị adị ichebe ha. bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.

Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri.

Amamihe bụ ndo

dịka ego si bụrụkwa ndo,

ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a:

Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.

Nʼotu aka ahụ kwa, Onyenwe anyị ekwuola na ndị niile na-ekwusa oziọma ya ga-esi nʼoziọma eweta nri ha ga-eri dị ndụ.

Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.

Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ."

bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.

Seja o primeiro
Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-