Publicidade

Isaías 54

Ebube dị nʼihu nye Zayọn

1 "Bụọ abụ, gị nwanyị aga,

gị onye na-amụtaghị nwa;

tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ,

gị onye ime nwa na-emetụbeghị;

nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ

karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,"

Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

2 "Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara,

gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị,

egbochila gbasapụ aka;

mee ka ụdọ gị dị ogologo,

meekwa ka o sie ike nke ọma.

3 Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ga-agbasa gaa;

ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha,

bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu.

4 "Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ.

gaghị abụkwa onye e wedara nʼala.

gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe bụ nwantakịrị,

na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.

5 Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di.

Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;

Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị,

Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.

6 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị

dịka a ga-asị na bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke na-ewutakwa nʼime mmụọ ya

bụ nwunye alụtara na nwantakịrị,

naanị ka bụrụ onye ajụrụ ajụ," ka Chineke gị na-ekwu.

7 "Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị.

Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị

8 Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m

zonarị gị ihu m,

ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị."

Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru.

9 "Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ,

bibie ndụ ndị dị nʼime ya,

ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ.

Agakwaghị m abasiri gị mba ike.

10 Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile,

wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha,

ma obi ebere m agaghị esi nʼebe nọ pụọ,

agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,"

ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.

11 "Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi,

lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị,

jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.

12 Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile,

jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile.

Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.

13 Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.

Udo ha ga-adịkwa ukwu.

14 Nʼezi omume ka a ga-eme ka guzosie ike.

Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe nọ,

nʼihi ya, gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla.

dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso,

nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe nọ.

15 bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, siteghị nʼaka m;

onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.

16 "Lee, bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụ

nke na-eji icheku afụ ọkụ

o ji akpụ ihe agha nke mbibi.

bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha.

17 Nʼụbọchị ahụ, dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire.

Ọzọ, ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide.

Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị.

Mkpepụta ha na-esite na m."

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-