Saúde
A saúde é uma bênção de Deus. A Bíblia ensina que Deus é nosso curador, que devemos cuidar do corpo como templo do Espírito e que a alegria do Senhor renova nossas forças.
Deus, o nosso curador
O Senhor é quem sara todas as nossas doenças. Ele prometeu abençoar o pão e a água e tirar as enfermidades do meio do seu povo.
Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu.
Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa
na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.
Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, "Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa.
O corpo como templo
Nosso corpo é templo do Espírito Santo. A Bíblia nos encoraja a cuidar da saúde física com disciplina e reverência a Deus.
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.
Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.
A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị.
Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike
gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
A alegria que cura
O coração alegre é bom remédio. A esperança do coração traz alegria, e as palavras agradáveis são como favo de mel — doçura para a alma e saúde para o corpo.
Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,
ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa.
Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ,
ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,
mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,
wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,
nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.