Publicidade

Eclesiastes 11

Ịgbasapụ aka

1 Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye

nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.

2 Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ

nʼihi na maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.

3 Mgbe eluigwe rujiri,

mmiri ga-ezo;

mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda,

ebe ahụ ka na-atọgbọ.

4 Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,

onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.

5 Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga

maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,

otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,

onye mere ihe niile.

6 Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,

esepụkwala aka nʼanyasị,

nʼihi na maghị nke ga-eto,

maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,

ha niile nwere ike too nke ọma.

Cheta Chineke nʼokorobịa gị

7 Ìhè dị ụtọ,

na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.

8 bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,

ya ṅụrịa nʼime ihe niile,

ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị

ga-adị ọtụtụ.

Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.

9 Nwa okorobịa, bụ ihe oke ọṅụ na bụ okorobịa.

Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị.

Mee ihe niile chọrọ ime;

gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ.

Kama, ghọtakwa nke a,

na ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.

10 Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,

wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,

nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-28_14-13-17-