Temor do Senhor
O temor do Senhor é o princípio da sabedoria. Não se trata de medo, mas de reverência profunda, respeito e admiração diante da santidade e grandeza de Deus.
O princípio da sabedoria
A Escritura afirma que temer ao Senhor é o primeiro passo para a verdadeira sabedoria. Quem teme a Deus discerne o certo e aprende a viver com prudência.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe;
ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta.
Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,
inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ amamihe na-abịa site nʼịdọ aka na ntị;
onye dị umeala nʼobi ga-anata ugwu na nsọpụrụ.
Ọ sịrị mmadụ,
"Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe;
ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta."
Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,
ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,
ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo,
karịa ọlaedo a nụchara anụcha;
ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,
karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị;
ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
Bênçãos do temor
Quem teme ao Senhor encontra vida longa, provisão e proteção. O temor de Deus nos guarda do mal e nos conduz à humildade.
Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị,
ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,
ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ;
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie;
ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.
Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ na-atụ egwu Chineke,
ma onye na-enupu isi na-etinye onwe ya na nsogbu.
Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma;
onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya,
nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
Vivendo no temor do Senhor
Temer ao Senhor é obedecer seus mandamentos, andar em seus caminhos e amá-lo de todo coração. Essa reverência se expressa em justiça e integridade.
Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.
Debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu.
Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;
jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Ụmụ m, bịanụ gee m ntị;
aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.
Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,
ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,
chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,
chọọ udo ma gbasookwa ya.
Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya."
" ‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.
Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
" ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu. Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla.
"Ana m agwa unu, ndị enyi m, unu atụla egwu maka ndị na-egbu anụ ahụ ma e mesịa, ha apụghị ime ihe ọzọ. Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu.