Tristeza
A tristeza faz parte da experiência humana, mas a Bíblia nos assegura que Deus está perto dos que sofrem. Ele enxuga as lágrimas e transforma a dor em esperança.
Deus consola os aflitos
O Senhor está perto dos quebrantados de coração. Mesmo no vale mais escuro, sua presença é refúgio e consolo para a alma que chora.
Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;
ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,
ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì,
Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba,
Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.
O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;
ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.
Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ,
nʼihi na a ga-akasị ha obi.
"Gaghachi azụ, gaa gwa Hezekaya, onye na-achị ndị m, ‘Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nna gị Devid, kwuru: Anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị, aga m agwọ gị. Aga m eme ka ahụ dị gị ike nʼụbọchị nke atọ site taa, mgbe ahụ ị ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
A alegria virá
A dor tem prazo de validade. A manhã de alegria sempre vem depois da noite de choro. Deus promete transformar o luto em dança.
Iwe ya adịghị adịgide tee anya,
ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!
Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,
ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, "Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha. Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala."
‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.
Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla.
Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’
okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ
ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha;
‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’
‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’"
Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile.
Entregando a dor a Deus
Podemos lançar sobre o Senhor toda nossa ansiedade e tristeza, porque Ele cuida de nós com ternura e não nos abandona.
Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba."
Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.
O choro e o arrependimento
Há tristezas que produzem arrependimento e conduzem à vida. O choro diante de Deus é acolhido e transformado em bênção.
"Ọ bụladị ugbu a," otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
"Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.
Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m."
Osisi vaịnị anwụọla.
Osisi fiig akpọnwụọla.
Osisi pomegranet na osisi nkwụ, na osisi apụl akpọnwụọla.
Nʼezie, osisi niile akpọnwụọla.
Nʼebe ndị mmadụ nọ,
ọṅụ alala.
Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala, kwuo sị:
"Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta
nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa.
Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile,
ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi."
Ilu dị iche iche nke Solomọn:
Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ;
ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,
oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.
Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,
wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,
nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.
Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.