Tudo posso naquele que me fortalece
Filipenses 4:13 é um dos versículos mais conhecidos da Bíblia. Essa declaração de Paulo não é sobre capacidade humana, mas sobre a suficiência de Cristo que nos fortalece em toda circunstância.
Fortalecidos em Cristo
Nossa capacidade vem de Deus, não de nós mesmos. Paulo aprendeu que em qualquer situação — abundância ou necessidade — Cristo é a fonte inesgotável de poder.
Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
Coragem e poder divino
Deus nos dá espírito de poder, amor e moderação. Nele somos mais que vencedores e podemos enfrentar qualquer adversidade.
Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Ụmụntakịrị m, unu bụ ndị sitere na Chineke, unu emeriekwala ha nʼihi na onye ahụ nke bi nʼime unu dị ukwuu karịa onye ahụ nọ nʼime ụwa.
Abụ nke iguzosi ike
Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Confiança e vitória
Quando lançamos nossas ansiedades sobre Deus e resistimos ao inimigo pela fé, experimentamos a renovação e a transformação que vêm do Senhor.
Hapụrụnụ ya nsogbu unu na nchegbu unu, nʼihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nʼobi.
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.
Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.