Publicidade

Vida

Por Bíblia Online

A vida é um dom precioso de Deus. Desde a concepção até a eternidade, as Escrituras revelam o propósito, o valor e a plenitude da vida que o Senhor nos oferece.

Deus, o autor da vida

O Senhor é quem dá a vida e a sustenta. Cada ser humano foi formado por suas mãos com propósito e intenção divina.

Adam na Iiv

Onyenwe anyị Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ.

Chineke maara ihe niile

Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.

Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m.

Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;

ọrụ gị niile dị ebube;

amaara m nke a nke ọma.

Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ

mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ,

mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.

Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.

E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị

tupu otu nʼime ha adịrị.

Ajọ omume mmadụ na ịdị mma Chineke

Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị;

ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.

Toonu Chineke onye okike

Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;

aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.

A vida em Cristo

Jesus é o caminho, a verdade e a vida. Nele encontramos sentido, plenitude e a promessa de vida abundante e eterna.

Jisọs bụ ụzọ

Jisọs sịrị ya, "Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m.

Onye ọzụzụ atụrụ na igwe atụrụ ya

Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.

Jisọs akasịe ụmụnne nwanyị Lazarọs obi

Jisọs gwara ya, "Mụ onwe m bụ mbilite nʼọnwụ na ndụ. Onye ọbụla kwere na m, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?"

Jisọs achịcha nke ndụ

Jisọs sịrị ha, "Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

Isi iyi mmiri nke ndụ

Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya."

A na-azọpụta onye ọbụla site nʼokwukwe

Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

A na-azọpụta onye ọbụla site nʼokwukwe

Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m.

Vivendo com sabedoria

A Bíblia nos orienta a viver com sabedoria, aproveitando bem o tempo, guardando o coração e buscando a vontade de Deus para cada dia.

Ebighị ebi Chineke na ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ

Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,

ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.

Amamihe Kachasị ihe niile

Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;

ị ga-enwekwa ndụ ogologo.

Amamihe Kachasị ihe niile

Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.

Amamihe Kachasị ihe niile

Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.

Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya,

onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.

Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!

Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.

Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,

ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ;

nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.

Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya

ga-achọta ndụ, na ugwu na ọganihu.

Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ.

A vida no dia a dia

Cada dia é uma oportunidade de glorificar a Deus. A Escritura nos chama a viver com propósito, confiança e fé prática.

Ekpere maka odudu na nnapụta

O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,

kuzikwaara m ụzọ gị niile.

Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ

Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m

ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,

m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị

mgbe niile ebighị ebi.

Ọgwụgwụ nke ndị na-emebi iwu

Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,

ma Chineke bụ ike nke obi m,

na ihe nketa m ruo ebighị ebi.

Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ

Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị.

Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.

Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata,

site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.

Oge m dị gị nʼaka

Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,

nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.

Abụ nke iguzosi ike

Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,

nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;

ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị

ụbọchị niile nke ndụ m,

na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,

na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.

Ọgwụgwụ ndụ mmadụ

Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,

were ndidi chere ya;

echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu,

mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.

Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile,

nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.

Prioridades e eternidade

Jesus nos lembra que a vida é mais que comida e o corpo mais que roupa. O que importa é buscar o Reino de Deus e viver para a eternidade.

Echegbula onwe unu

"Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya? Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha? Onye nʼetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya?

Ihe ọ ga-efu iso Jisọs

Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha?

Ihe ọ ga-efu iso Jisọs

Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, "Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ. Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya. Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha? Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya? Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ."

Ilu banyere ọgaranya dị nzuzu

Ma ọ sịrị ha, "Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere."

Ekpere Jisọs kpeere Onyenwe ya

Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa.

Ịbụ ohu nke ezi omume

Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.

Aja dị ndụ

Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.

Ebe obibi anyị nʼeluigwe

Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ.

Ndụmọdụ na ịdọ aka na ntị

Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị.

Ibi ndụ na-atọ Chineke ụtọ

Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu, nke a ga-eme ka ndụ unu na-ebi kwa ụbọchị wetara unu nsọpụrụ nʼebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, meekwa ka unu ghara i dabere nʼonye ọbụla.

Okwu dịrị ezinaụlọ ndị nke Kraịst

Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ. Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi.

Ọnwụnwa na nsogbu

Ngọzị na-adịrị onye ahụ nke na-anọgide na-adịghị ada mba nʼoge ọnwụnwa. Nʼihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị niile hụrụ ya nʼanya.

Ụdị amamihe abụọ dị

Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala.

Ịhụ ahụhụ nʼihi ime ihe dị mma

Nʼihi na,

"Onye ọbụla nke na-achọ ndụ,

nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma,

ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ

meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.

Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe;

ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya.

Ka ihe niile too Onyenwe anyị

Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị.

Ihe niile nwere oge

Ihe ọbụla nwere oge;

mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.

Ndụ maọbụ ọnwụ

Enyela m gị iwu taa, sị gị hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya, ana m asịkwa gị gbasoo ụzọ ya, ma debekwa iwu na ụkpụrụ ya niile, ka ị dịrị ndụ, ghọọkwa mba buru ibu, ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị gọzie gị nʼala ahụ ị na-aga inweta.

Iwu Iri

Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Ebighị ebi Chineke na ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ

Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa,

maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide,

ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude,

nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.

Nkwupụta mmehie

"O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m

na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile;

mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.

I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta;

ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị.

Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume

ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela

"Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo

nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ,

na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.

Chineke dị mma

Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,

ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,

chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,

chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.

Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,

chọọ udo ma gbasookwa ya.

Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,

a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.

Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri

otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-22_10-02-25-