Publicidade

A volta de Jesus

Por Bíblia Online

A volta de Jesus é uma das maiores promessas da Bíblia. Cristo prometeu que retornará em glória, e os cristãos vivem na expectativa desse dia triunfante.

A promessa do retorno

Jesus prometeu aos discípulos que voltaria. Os anjos confirmaram essa promessa na ascensão, e os apóstolos ensinaram que Ele virá com poder.

Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi? bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ.

Mgbe o kwusiri nke a, e weliri ya elu mgbe ha na-ele anya, igwe ojii kpuchikwara ya, zopu ya nʼanya ha.

Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso. Ha sịrị, "Ndị ikom Galili, gịnị mere unu jiri guzoro ebe a na-ele anya nʼeluigwe? Jisọs a onye e sitere nʼetiti unu kpọrọ laa nʼeluigwe ga-alọghachikwa otu ahụ unu si hụ ya o siri laa nʼeluigwe."

Onye ahụ gbara ama ihe ndị a niile na-asị, "Nʼezie, ana m abịa ọsịịsọ."

Amen. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs.

Ịdọ aka na ntị nakwa ọkpụkpọ oku

"Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka.

Os sinais e o momento

Ninguém sabe o dia nem a hora. Jesus alertou sobre falsos sinais e nos chamou à vigilância constante, pois Ele virá como ladrão na noite.

O nweghị onye maara mgbe ga-abụ

"Ma o nweghị onye ọbụla maara ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ ga-abụ. bụladị ndị mmụọ ozi nọ nʼeluigwe amaghị ya. Ọkpara ahụ amakwaghị. bụ naanị Nna maara ya. Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka dị nʼụbọchị Noa. Nʼoge ahụ tupu iju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri na aṅụ, na-emekwa mmemme ọlụlụ di na nwunye, ruo ụbọchị Noa banyere nʼime ụgbọ mmiri ya. Ha amataghị ihe ga-eme tutu oke mmiri ahụ abịa kpochapụ ha niile. Otu ahụ ka ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị.

Mmadụ ọbụla amaghị oge ahụ

"Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya.

Ịnọ na nche

Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na dị mkpa i degara unu akwụkwọ. Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị. Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.

"Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. Ma ghọtanụ nke a: bụrụ na nna nwe ụlọ mara oge onye ohi ga-abịa nʼụlọ ya nʼabalị, ga-anọ na nche nʼoge ahụ. gaghị ekwe ka onye ohi kụwaa ụlọ ya. Otu a ka unu onwe unu pụrụ isi nọgide na nche oge niile, nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼoge awa unu na-atụghị anya ya.

Onye mmebi iwu ahụ

Ma ihe banyere ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na nzukọ anyị na ya ga-ezukọta, anyị na-adụsị unu ọdụ ike ụmụnna. Ka unu ghara ịma jijiji maọbụ ịtụ egwu nʼuche unu nʼihi amụma, maọbụ okwu maọbụ akwụkwọ ozi e dere dị ka o sitere nʼaka anyị, nke na-asị nʼụbọchị Onyenwe anyị eruola. Unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu nʼụzọ ọbụla, nʼihi na ụbọchị ahụ agaghị abịa tutu ruo mgbe oke inupu isi ga-adị, na mgbe a ga-ekpughe onye mmebi iwu ahụ nke a kara akara ịla nʼiyi. Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu megide ihe niile a na-akpọ chi maọbụ nke a na-efe ofufe, nke ga-eme ka o dozie onwe ya nʼụlọnsọ Chineke, na-ekwupụta na ya bụ Chineke.

A glória da segunda vinda

Cristo voltará nas nuvens, com poder e grande glória. Os mortos em Cristo ressuscitarão, e os vivos serão arrebatados para encontrá-lo nos ares.

Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.

Ọbịbịa Onye nke nzọpụta

"Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ,

" anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,

ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya;

kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada,

ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.

"Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. Mgbe ahụ, ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.

Ikpe nke ikpeazụ

"Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube ya na ndị mmụọ ozi niile, mgbe ahụ ka ga-anọ nʼelu ocheeze ebube ya. Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu. ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.

Onye nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ọcha

Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha. Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. "ga-eji mkpara igwe achị ha." na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya:

Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile.

Onye ọbụla ihere m na ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa Nwa nke Mmadụ mgbe ga-abịa nʼebube ya, na nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.

Vivendo na expectativa

A certeza do retorno de Cristo nos chama a viver em santidade, aguardando novos céus e nova terra onde habita a justiça.

Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.

Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.

Ebe bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka bịa ngwangwa. Nʼihi na bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.

Dị ka bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie, otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma bụghị nʼihi ibu mmehie, kama bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-