54 Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, "Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile."15:54 Aịz 25:8
55 "Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị?
Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?"15:55 Hos 13:14