7 Ndị enyi m hụrụ nʼanya, anaghị m edere unu ihe gbasara iwu ọhụrụ, kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ, nke na-adị site na mbụ. Iwu ochie a bụ nke e ziri unu ozi banyere ya. 8 Ma otu ọ dị, ana m edere unu iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu nʼime ya na nʼime unu. Nʼihi na ọchịchịrị na-agafe, ezi ìhè ebidola ịchawapụta.