Pular para o conteúdo
Publicidade

1 João 4

10 Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị. 11 Ndị m hụrụ nʼanya, ebe bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. 12 O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.

Veja também