Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Ndị Eze 1

11 Mgbe ahụ, Netan onye amụma jụrụ Batsheba nne Solomọn ajụjụ sị, "nụghị na Adonaịja nwa Hagit aghọọla eze ugbu a, ma onyenwe anyị bụ Devid amaghị ihe ọbụla banyere ya? 12 Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn. 13 Bakwuru eze Devid sị ya, Onyenwe m bụ eze, bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: "Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ga-anọdụ nʼocheeze m"? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?

Veja também