41 Emesịa, Ịlaịja gwara Ehab okwu sị, "Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada." 42 Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.
43 Nʼoge a, ọ gwara nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, "Gaa lee anya nʼụzọ oke osimiri." Ọ rịgoro lee anya, sị,
"Ọ dịghị ihe ọbụla m hụrụ."
Ịlaịja gwakwara ya otu a, ugboro asaa, sị ya, "Jeghachi."
44 O ruo na nke ugboro asaa, nwokorobịa ahụ bịaghachiri sị Ịlaịja, "Onyenwe m, ahụrụ m igwe ojii dị nta dịka ọbụ aka mmadụ ka o si nʼoke osimiri na-apụta."
Ya mere, Ịlaịja sịrị, "Gaa gwa Ehab, ‘dozie ụgbọ agha gị, gbadaa tupu mmiri ozuzo egbochi gị ịla.’ "
45 Ọ dịghị anya, eluigwe gbajikọtara nnọọ oji. Oke ifufe bidokwara ife. Mmiri dị ukwuu bidokwara izo. Mgbe ahụ, Ehab gbaara ụgbọ agha ya laa Jezril.