22 Hana esoghị ha, ọ gwara di ya, "Mgbe nwantakịrị a kwụsịrị ịṅụ ara,1:22 Nʼoge ochie, adịghị anapụ ụmụntakịrị ara ọsịịsọ, kama ọ bụ mgbe ha gbara afọ atọ maọbụ karịa. ka m duru ya ga chee ya nʼihu Onyenwe anyị, ọ ga-ebikwa nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi."
23 Elkena bụ di ya sịrị ya, "Mee ihe ọbụla i chere kwesiri ekwesi. Nọdụ ruo mgbe ọ hapụrụ ịṅụ ara, ma ka Onyenwe anyị mezuo okwu ya." Hana nọgidere nʼụlọ tutu ruo mgbe ọ zụlitere nwantakịrị ahụ, kwụsị ya ịṅụ ara.
24 Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.