Pular para o conteúdo
Publicidade

1 Samuel 2

Ụmụ ọjọọ Elayị

12 Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya. 13 Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya. 14 na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo. 15 Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja,2:15 Nʼiwu e nyere banyere ịchụ aja, abụba na anụ niile abụba kpuchiri ka a na-akpọ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Lev 3:3-5,16; 4:8-10 ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, "Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka chọrọ."

16 bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, "Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe chọrọ," onyeozi ahụ na-aza sị, "Nye m anụ ahụ ugbu a, bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya."

17 Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya.

Veja também