41 Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa.
42 Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, "Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’ " Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.