Publicidade

1 Samuel 5

6 Aka Onyenwe anyị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile. 7 Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, "Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn." 8 Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, "Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?"

Ha zara, "Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat." Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat.

9 Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka5:9 Dit 2:15; 1Sa 5:11; 12:15 Onyenwe anyị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ. 10 Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn.

Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, "Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!" 11 Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, "Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị." Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-