4 Kama nʼime ihe niile, anyị na-agbalịsị ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachiobi na-edi nsogbu niile na mkpagbu niile na ahụhụ niile na-adakwasị anyị. 5 A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri, 6 nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ, 7 sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe. 8 Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu. 9 Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị. 10 Anyị na-anọ nʼihe mwute mgbe niile, ma lee ọṅụ juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọbụla, ma lee anyị nwere ihe niile.
Publicidade