Publicidade

2 Coríntios 7

10 Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ. 11 Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-