10 Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa. 11 Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.
Publicidade