Pular para o conteúdo
Publicidade

2 Reis 2

Ezi mmiri ọṅụṅụ

19 Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, "Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri."

20 Ịlaisha zara sị ha, "dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya." Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.

21 Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe na-eme nke a, o kwuru okwu sị, "Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’ " 22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.

Veja também