Mmanụ oliv nwanyị di ya nwụrụ
1 Otu ụbọchị, otu nwanyị nʼime ndị inyom ndị amụma bịakwutere Ịlaisha rịọ ya sị, "Ohu gị, bụ di m anwụọla. Ị matara na ọ na-atụ egwu4:1 Ọ sọpụụrụ Onyenwe anyị Onyenwe anyị. Ma ugbu a, onye o ji ụgwọ na-abịa ịkpọrọ ụmụ m ndị ikom abụọ ime ka ha bụrụ ndị ohu ya."
2 Ịlaisha jụrụ ya ajụjụ sị, "Gịnị ka m ga-emere gị? Gwa m, gịnị ka i nwere nʼụlọ?"
Nwanyị ahụ zara sị, "O nweghị ihe ọbụla ohu gị nwanyị nwere nʼụlọ karịa naanị ntakịrị mmanụ."4:2 Mmanụ bụ otu ngwa nri dị mkpa na nri niile ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ na-eri. Mkpa ọ dị bụ na ọ na-edozi ahụ mmadụ.
3 Ịlaisha sịrị, "Jegharịa na-ezi, gaa nata ndị agbataobi gị niile ite nke ihe ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha abụkwala ole na ole. 4 Mgbe ahụ, baa nʼime ụlọ, gị na ụmụ gị, mechibido onwe unu ụzọ. Malite ịgbanye mmanụ ahụ nʼime ite ahụ niile, mgbe nke ọbụla juru, bupụ ya nʼotu akụkụ."
5 Nwanyị ahụ hapụrụ ya, ga mechibido onwe ya na ụmụ ya ndị ikom ụzọ. Ha na-ebutere ya ite niile ahụ nso, ebe ya onwe ya na-agbanye agbanye nʼime ha. 6 Mgbe ọ gbajuru ite ndị ahụ niile, ọ sịrị nwa ya, "Butere m ite ọzọ."
Ma ọ zara, "O nweghị ite ọzọ fọdụrụ." Mgbe ahụ, mmanụ ahụ kwụsịrị ịgbapụta.
7 Ọ gara gwa onye nke Chineke ahụ, onye sịrị, "Gaa, ree mmanụ ahụ, kwụkwaa ụgwọ unu ji. Gị na ụmụ gị ndị ikom were nke fọdụrụ mee mkpa dịrị unu."