11 Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị. 12 Ma onye ọbụla na-emeri emeri, ka m ga-eme ka ọ bụrụ ogidi nʼime ụlọnsọ Chineke m. Ọ gaghị esikwa nʼebe ahụ pụọ apụọ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nʼahụ, na aha obodo nsọ Chineke, nke bụ Jerusalem ọhụrụ ahụ si nʼeluigwe, ebe Chineke nọ na-arịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nʼihu ya.
Publicidade
Publicidade