Pular para o conteúdo
Publicidade

Ọrụ Ndị Ozi 8

18 Mgbe Saimọn hụrụ na a na-enye Mmụọ Nsọ naanị site nʼaka ndị ozi bikwasịrị ha nʼisi, o chere ha ego nʼihu, 19 sị, "nyekwanụ m ike a. Ka onye ọbụla m bikwasịrị aka nʼisi nata Mmụọ Nsọ."

20 Ma Pita sịrị, "Gị na ego gị laakwa nʼiyi. Nʼihi na i chere na ga-eji ego zụta onyinye Chineke. 21 I nweghị oke maọbụ ihe nketa nʼọrụ a, nʼihi na obi gị ezighị ezi nʼihu Chineke. 22 Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị. 23 Nʼihi na ahụrụ m na jupụtara nʼobi ilu na nọkwa nʼagbụ nke ajọ omume."

24 Saimọn zara Pita sị, "Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a niile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também