9 "Anọkwa m na-ele anya
"hụ ka e doziri ocheeze,
ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ.
Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo,
agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha.
Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ,
ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.
10 Iyi na-asọ ka ọkụ
si nʼihu ya na-asọpụta.
Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi.
Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya.
Ndị ikpe nọdụrụ ala,
asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.