Pular para o conteúdo
Publicidade

Deuteronômio 11

18 Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. 19 Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe na-aga nʼokporoụzọ, mgbe na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. 20 Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị. 21 Ka ụbọchị ndụ unu na nke ụmụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya, nke Onyenwe anyị kwere nna unu na nkwa. Dịka ogologo ụbọchị niile ha nke eluigwe dị nʼelu, ụwa dịkwa nʼokpuru ya.

Veja também