16 Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya,
meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.
17 Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke,
bụ chi ndị ha na-amaghị,
chi ndị ka pụtara ọhụrụ,
chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha.
18 Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ,
i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị.