Pular para o conteúdo
Publicidade

Ester 4

Mọdekai agwa Esta maka nsogbu ha

1 Mgbe Mọdekai nụrụ ihe mere, dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya, pụọ baa nʼime obodo, na-eti mkpu akwa. 2 bịaruru nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọeze guzo nʼebe ahụ, nʼihi na dịghị onye a na-ekwe ka o yiri akwa mkpe banye nʼogige ụlọeze. 3 Nʼalaeze ahụ ndị Juu niile, nọ nʼiru ụjụ na ibu ọnụ na ịkwa akwa na iti aka nʼobi nʼihi iwu eze ahụ. Ọtụtụ yikwa akwa mkpe ha, dinarakwa na ntụ.

4 Mgbe ụmụ agbọghọ na ndị onozi Esta gwara ya ihe banyere Mọdekai, o wutere ya nke ukwuu. O zigaara Mọdekai uwe, ka o nwee ike gbanwee uwe mkpe ahụ o yi, ma naraghị ha. 5 Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a.

6 Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze. 7 Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi. 8 O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. gwara ya ka o nye ya iwu ka bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya.

9 Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru. 10 Ma Esta gwara Hatak ka o jeghachi gwa Mọdekai sị, 11 "Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m."

12 Mgbe ha gwara Mọdekai ihe Esta zara, 13 o zighachiri ọsịsa a, "Echela nʼihi na i bi nʼụlọeze na naanị gị ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị Juu niile. 14 bụrụ na gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?"

15 Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị; 16 "Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, bụ ezie na bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe pụtara ya pụta. pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!"

17 Mọdekai pụrụ, gaa mee dịka Esta gwara ya.

Veja também