Pular para o conteúdo
Publicidade

Gênesis 1

26 Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, "Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala."

27 Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya,

nʼoyiyi Chineke ka o kere ha,

nwoke na nwanyị ka o kere ha.

28 Chineke gọziri ha sị ha, "Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala."

Veja também