Jekọb agbakwuru Leban
41 Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, "Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb."
42 Mgbe a gwara Ribeka ihe nwa ya nwoke nke okenye bụ Ịsọ kwuru, o ziri kpọọ nwa ya nwoke nke nta bụ Jekọb sị ya, "Lee, Ịsọ nwanne gị na-akasị onwe ya obi site nʼechiche ọ na-eche igbu gị. 43 Nʼihi nke a, nwa m nwoke, mee ihe m gwara gị, gbapụ ọsọ ngwangwa, gbakwuru nwanne m Leban na Haran, 44 Nọdụ nʼebe ahụ ruo mgbe iwe nwanne gị ga-adajụ. 45 Mgbe nwanne gị kwụsịrị iwe iwe megide gị, mgbe o chefuru ihe i mere ya, aga m ezitere gị ozi ka ị lọta. Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbara aka unu abụọ nʼotu ụbọchị."